1 Ndị Eze 18

Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”

1 Kings 18:14 (UKJV) And now you says, Go, tell your lord, Behold, Elijah is here: and he shall slay me.

12Ọ bụrụkwanụ na m esite nʼebe a pụọ, onye ma ebe Mmụọ Onyenwe anyị ga-ebuga gị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na Ehab abịa hapụ ịhụ gị, ọ ga-egbu m. Nʼihi na mụ bụ ohu gị bụ onye na-efe Onyenwe anyị ofufe siterị na mgbe m bụ okorobịa.

13Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.

14Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”

15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”

16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.