13Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.
14Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”
15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”
16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.
17Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”