1 Ndị Eze 18

Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.

1 Kings 18:16 (UKJV) So Obadiah went to meet Ahab, and told him: and Ahab went to meet Elijah.

14Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”

15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”

16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.

17Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”

18Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.