1 Ndị Eze 18

Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”

1 Kings 18:17 (UKJV) And it came to pass, when Ahab saw Elijah, that Ahab said unto him, Are you he that troubles Israel?

15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”

16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.

17Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”

18Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.

19Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.