1 Samuel 1

Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.

1 Samuel 1:3 (UKJV) And this man went up out of his city yearly to worship and to sacrifice unto the LORD of hosts in Shiloh. And the two sons of Eli, Hophni and Phinehas, the priests of the LORD, were there.

1O nwere otu nwoke onye Zuf, si na Ramataim, nʼala ugwu ugwu Ifrem. Aha ya bụ Elkena nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Ifrem.

2Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.

3Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.

4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.

5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.