3Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.
4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.
5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
6Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
7Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.