1 Samuel 1

Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

1 Samuel 1:6 (UKJV) And her adversary also provoked her sore, in order to make her fret, because the LORD had shut up her womb.

4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.

5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

6Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

7Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.

8Mgbe Hana bidoro ịkwa akwa otu a, Elkena na-ajụ ya sị, “Hana, ọ bụ gịnị mere i ji na-akwa akwa? Gịnị mere ị naghị eri nri? Gịnị mere obi ji ajọ gị njọ? Ọ bụ na mụ adịghị gị mma karịa ụmụ ndị ikom iri nye gị?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.