1 Samuel 1

Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.

1 Samuel 1:4 (UKJV) And when the time was that Elkanah offered, he gave to Peninnah his wife, and to all her sons and her daughters, portions:

2Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.

3Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.

4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.

5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

6Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.