1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
2Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’
3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.