1 Samuel 12

“Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.

1 Samuel 12:16 (UKJV) Now therefore stand and see this great thing, which the LORD will do before your eyes.

14Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.

15Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.

16“Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.

17Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”

18Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.