22Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.”
23Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla. Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina.
24Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,
25O doziri nri nʼihu Sọl na ndị ikom ya. Ha rikwara ya. Ha biliri laa nʼabalị ahụ.