20Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.
21Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.
22Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.”
23Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla. Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina.
24Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,