1 Samuel 29

Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia.

1 Samuel 29:2 (UKJV) And the lords of the Philistines passed on by hundreds, and by thousands: but David and his men passed on in the rear guard with Achish.

1Ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha bịaruo Afek, ma ndị agha Izrel zukọtara nʼakụkụ isi iyi Jezril.

2Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia.

3Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.”

4Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.