8Onyenwe anyị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Mgbe ahụ, Elayị ghọtara na ọ bụ Onyenwe anyị na-akpọ nwantakịrị ahụ,
9nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.
10Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!” Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.”
11Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru.
12Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.