9nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.
10Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!” Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.”
11Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru.
12Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
13Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya, ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha.