1 Samuel 3

Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.” Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”

1 Samuel 3:16 (UKJV) Then Eli called Samuel, and said, Samuel, my son. And he answered, Here am I.

14Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ”

15Samuel dinara ala tutu ruo ụtụtụ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ọnụ ụzọ ụlọ nzute Onyenwe anyị dịka ọ na-eme. Ma egwu tụrụ ya ịgwa Elayị ọhụ ahụ.

16Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.” Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”

17Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.”

18Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.