1Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.
3Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
4Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel.