18Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem.
19Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
20Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”
21Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
22Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”