2 Ihe E Mere 29

Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.

2 Chronicles 29:10 (UKJV) Now it is in mine heart to make a covenant with the LORD God of Israel, that his fierce wrath may turn away from us.

8Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.

9E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.

10Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.

11Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”

12Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.