2 Ihe E Mere 31

Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.

2 Chronicles 31:5 (UKJV) And as soon as the commandment came abroad, the children of Israel brought in abundance the first- fruits of corn, wine, and oil, and honey, and of all the increase of the field; and the tithe of all things brought they in abundantly.

3Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.

4O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị.

5Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.

6Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu

7Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.