2 Ihe E Mere 31

Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.

2 Chronicles 31:7 (UKJV) In the third month they began to lay the foundation of the heaps, and finished them in the seventh month.

5Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.

6Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu

7Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.

8Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.

9Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.