6Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu
7Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
8Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
9Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
10Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”