7Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
8Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
9Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
10Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”
11Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.