2 Ihe E Mere 6

“Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.

2 Chronicles 6:40 (UKJV) Now, my God, let, I plead to you, yours eyes be open, and let yours ears be attentive unto the prayer that is made in this place.

38Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndọta nʼagha ha, bụ ebe a kpọrọ ha gaa, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị

39mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha niile, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị.

40“Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.

41“Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. Ka ndị nchụaja gị, O Onyenwe anyị Chineke, yiri nzọpụta dịka uwe. Ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi ṅụrịa ọṅụ nʼihi ịdị mma gị.

42O Onyenwe anyị Chineke, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. Chetakwa oke ịhụnanya nke ị kwere Devid bụ ohu gị na nkwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.