40“Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.
41“Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. Ka ndị nchụaja gị, O Onyenwe anyị Chineke, yiri nzọpụta dịka uwe. Ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi ṅụrịa ọṅụ nʼihi ịdị mma gị.
42O Onyenwe anyị Chineke, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. Chetakwa oke ịhụnanya nke ị kwere Devid bụ ohu gị na nkwa.”