39mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha niile, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị.
40“Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.
41“Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. Ka ndị nchụaja gị, O Onyenwe anyị Chineke, yiri nzọpụta dịka uwe. Ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi ṅụrịa ọṅụ nʼihi ịdị mma gị.
42O Onyenwe anyị Chineke, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. Chetakwa oke ịhụnanya nke ị kwere Devid bụ ohu gị na nkwa.”