22Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
23Ndị eze niile nke ụwa na-achọ ihu Solomọn, ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
24Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
25Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.
26Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt.