2 Ihe E Mere 9

Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.

2 Chronicles 9:25 (UKJV) And Solomon had four thousand stalls for horses and chariots, and twelve thousand horsemen; whom he bestowed in the chariot cities, and with the king at Jerusalem.

23Ndị eze niile nke ụwa na-achọ ihu Solomọn, ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.

24Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.

25Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.

26Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt.

27Eze mere ka ọlaọcha baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.