2 Ndị Kọrint 10

Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu.

2 Corinthians 10:1 (UKJV) Now I Paul myself plead to you by the meekness and gentleness of Christ, who in presence am base among you, but being absent am bold toward you:

1Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu.

2Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya.

3Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.