13Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.
14Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu.
15Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ.