2 Ndị Kọrint 11

Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?

2 Corinthians 11:29 (UKJV) Who is weak, and I am not weak? who is offended, and I burn not?

27Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi.

28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ.

29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?

30Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.

31Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.