28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ.
29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?
30Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.
31Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu.
32Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m.