18Mgbe ahụ, Joab zigara ozi gwa Devid otu agha si na-aga,
19Ọ gwara onyeozi ahụ sị, “Mgbe ị gwachara eze akụkọ ihe gbasara otu agha si gaa
20iwe nwere ike iwe eze nke ukwu, na o nwere ike jụọ gị sị, ‘Gịnị mere unu ji gaa mgbidi obodo ahụ nso ịlụ agha? Ọ bụ na unu amaghị na a ga-esi nʼelu mgbidi ahụ gbaa àkụ?
21Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ”
22Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie.