2 Samuel 19

Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?

2 Samuel 19:10 (UKJV) And Absalom, whom we anointed over us, is dead in battle. Now therefore why speak all of you not a word of bringing the king back?

8Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya.

9Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”

10Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?

11Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi?

12Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.