9Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”
10Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?
11Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi?
12Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’
13Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ”