2 Samuel 19

Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”

2 Samuel 19:9 (UKJV) And all the people were at strife throughout all the tribes of Israel, saying, The king saved us out of the hand of our enemies, and he delivered us out of the hand of the Philistines; and now he is fled out of the land for Absalom.

7Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.”

8Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya.

9Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”

10Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?

11Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.