2 Samuel 19

O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị.

2 Samuel 19:27 (UKJV) And he has slandered your servant unto my lord the king; but my lord the king is as an angel of God: do therefore what is good in yours eyes.

25Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?”

26Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m.

27O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị.

28Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?”

29Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na Ziba iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.