27O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị.
28Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?”
29Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na Ziba iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.”
30Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.”
31Bazilai onye Gilead sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ.