2 Samuel 20

Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”

2 Samuel 20:19 (UKJV) I am one of them that are peaceable and faithful in Israel: you seek to destroy a city and a mother in Israel: why will you swallow up the inheritance of the LORD?

17Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”

18Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu.

19Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”

20Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi.

21Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.