1Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke.
2Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta,
3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?”
4Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị.
5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m.