1Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
2Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
3Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.