Emọs 4

Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Amos 4:3 (UKJV) And all of you shall go out at the breaches, every cow at that which is before her; and all of you shall cast them into the palace, says the LORD.

1Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”

2Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.

3Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

4“Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla.

5Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.