Emọs 9

Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

Amos 9:10 (UKJV) All the sinners of my people shall die by the sword, which say, The evil shall not overtake nor prevent us.

8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, aga m ayọgharị ụlọ Izrel nʼetiti mba niile dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.

10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

11“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.

12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.