Daniel 4

Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Daniel 4:3 (UKJV) How great are his signs! and how mighty are his wonders! his kingdom is an everlasting kingdom, and his dominion is from generation to generation.

1Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma!

2E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.

3Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

4Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m.

5Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.