3Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
4Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m.
5Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.
6Nʼihi ya, enyere m iwu ka a kpọọ ndị amamihe niile m nwere na Babilọn ka ha bịa nʼihu m, bịa kọwaara m isi nrọ ahụ.
7Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.