Diuteronomi 10

Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe,

Deuteronomy 10:12 (UKJV) And now, Israel, what does the LORD your God require of you, but to fear the LORD your God, to walk in all his ways, and to love him, and to serve the LORD your God with all your heart and with all your soul,

10Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu.

11Onyenwe anyị gwara m, “Bilie, gaa ka i duru ndị a gaa na njem ha, ka ha banye, ma nwetakwa ala ahụ nke m kwere nna nna ha na nkwa inye ha.”

12Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe,

13na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.

14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.