Diuteronomi 12

Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.

Deuteronomy 12:18 (UKJV) But you must eat them before the LORD your God in the place which the LORD your God shall choose, you, and your son, and your daughter, and your manservant, and your maidservant, and the Levite that is within your gates: and you shall rejoice before the LORD your God in all that you put yours hands unto.

16Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri.

17Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.

18Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.

19Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.

20Mgbe Onyenwe anyị, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.