18Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.
19Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.
20Mgbe Onyenwe anyị, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ.
21Ọ bụrụ nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke Onyenwe anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ.
22Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha.