17Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị.
18Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.
19Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị.
20Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.
21Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.