Diuteronomi 15

Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.

Deuteronomy 15:20 (UKJV) You shall eat it before the LORD your God year by year in the place which the LORD shall choose, you and your household.

18Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.

19Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị.

20Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.

21Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.

22Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.